Fasil Assefa
Ụdịekere | nwoke ![]() |
---|---|
mba o sị | Ethiopia ![]() |
Ụbọchị ọmụmụ ya | 27 Jenụwarị 1984 ![]() |
Ebe ọmụmụ | Addis Ababa ![]() |
Ọrụ ọ na-arụ | omenkà ![]() |
Ụdị ọrụ ya | art of painting ![]() |
Fasil Assefa Beyene (a mụrụ n'ụbọchị nke ịrị abụọ na asaa n'ọnwa Jenụwarị n'afọ 1984) bụ onye Etiopia na-ese ihe nke a maara maka isiokwu ya kachasị mkpa bụ hustle and bustle of Merkato, na igosipụta nka pop nke Etiopia site na eserese ya.
A nabatara ya dị ka onye nnọchi anya udo site na Universal Peace Foundation, na Inter Religious and International Federation for World Peace.
Akụkọ ndụ[dezie | dezie ebe o si]
A mụrụ ya na Addis Abeba nye Asnakech Degefu na Assefa Beyene, ọ tolitere na gburugburu ebe obibi dị ka nwa ikpeazụ n'ime ụmụ ịrị na otu. Mgbe Assefa bụ nwata ma ka nọ n'ụlọ akwụkwọ sekọndrị Abedissa, ọ na-enwe mmasị mgbe niile na eserese Jizọs nke dị n'ụlọ ndị agbata obi ya ma na-agbalị mgbe niile imegharị ya. Ọ na-agakarị njem.
Talent Assefa na eserese na-enwu gbaa mgbe nke ahụ gasịrị nke mere ka ọ họrọ eserese dị ka ụzọ ọrụ. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ na ụlọ akwụkwọ sekọndrị n'afọ 2001, ọ debara aha ya na Master Abyssinian fine Art na ụlọ ọrụ ọzụzụ ọrụ aka mgbe ahụ ọ nwetara diplọma ya n'afọ 2002 site na ngalaba eserese mgbe ahụ ọ gụsịrị akwụkwọ nweta asambodo site na Abyssinia fine Art na ụlọ ọrụ ọzụzụ ọrụ aka n'afọ 2003.
Mgbe e mesịrị, Assefa nọgidere na-ese ihe ma na-arụ ọrụ dị ka onye nkuzi nka, wee gaa n'ihu na-amụ ihe na Addis Ababa University School of Fine Arts na imewe site na 2005–2007; n'ikpeazụ, ọ dị njikere igosipụta ihe ngosi nka mbụ ya nke e mere na Imperial Hotel na Addis abeba n'okpuru aha Colors of the Millennium, Colors of Millennium ngosi emeghewo ọnụ ụzọ maka Fasil dị ka onye na-ese ihe osise ma site na nke ahụ gaa n'ihu, Assefa malitere ịghọ onye na-ese ihe osise oge niile ma gosipụta ihe ngosi nka.
Ihe ngosi[dezie | dezie ebe o si]
Ngosipụta o mere naanị ya[dezie | dezie ebe o si]
Afọ | Ebe | Aha |
---|---|---|
2008 | Imperial Hotel Addis Abeba | Agba nke Narị Afọ Iri |
2013 | National Museum of Ethiopia | Obodo mara mma |
Ihe ngosi otu[dezie | dezie ebe o si]
Afọ | Ebe | Aha |
---|---|---|
2001 | Russian Center For Science of Culture | |
2002 | Ụlọ ihe nkiri mba Etiopia | |
2003 | Ụlọ ihe nkiri mba Etiopia | |
2007 | Addis Ababa University School of Fine Arts and Design Gallery | |
2011 | National Museum of Ethiopia | |
2011 | Sheraton Addis Abeba Hotel | Art nke Ethiopia |
2012 | Sheraton Addis Abeba Hotel | Art nke Ethiopia |
2013 | Sheraton Addis Abeba Hotel | Art nke Ethiopia |
2017 | Art Revolution Taipei |
Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]
- http://www.arts.org.tw/2017/eng/news170415k.html
- http://www.imagomundiart.com/artworks/fasil-assefa-beyene-transportation
- https://www.addiszefen.com/news/african-identity-underlies-sheraton%E2%80%99s-art-of-ethiopia/
- https://www.thenextcanvas.com/fasil-assefa/
- https://stgeorgeofethiopia.com/fasil-assefa/
- https://www.sewasew.com/p/who-is-painter-fasil-assefa-%E1%88%B0%E1%8B%93%E1%88%8A-%E1%8D%8B%E1%88%B2%E1%88%8D-%E1%8A%A0%E1%88%B0%E1%8D%8B
- https://www.academia.edu/20121724/An_Epic_Chronicle_Renaissance_of_Ethiopian_Contemporary_Art_2005-2015_RP_Vol._IX_No._XXX_MMXVI
- https://issuu.com/gooddesignischeap/docs/sheraton_addis_art_of_ethiopia_brochure_2011_final
- http://www.accademiariaci.info/compfile2019/winners/